Proverbs 13

1Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya
ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba.

2Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ,
ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha.

3Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!
Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.

4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta;
ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.

5Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,
ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu
na-ewetara ya ihere na nkọcha.

6Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile,
ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.

7Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa.
Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.

8Ọgaranya nwere ike jiri ego ya gbapụta onwe ya,
ma ogbenye adịghị azaghachi mba banyere imerụ ya ahụ.

9Ìhè onye ezi omume na-enwupụ enwupụ,
ma oriọna onye mmebi iwu ga-anyụ.

10Nganga na-eweta esemokwu,
ma a na-ahụ amamihe nʼime ndụ ndị na-anata ndụmọdụ.

11Akụ a kpatara ngwangwa na-emebikwa ngwangwa;
ma akụ sitere nʼịrụsị ọrụ ike na-eto eto.

12Nchere a na-echere ogologo oge maka imezu olileanya e nwere na-egbu obi,
mgbe ihe a na-eche mezuru, oke ọṅụ na-adị.

13Onye na-elelị ntụziaka anya ga-akwụ ụgwọ nʼihi ya,
ma onye na-atụ egwu ihe enyere nʼiwu ga-anata ụgwọ ọrụ ya.

14Nkuzi nke onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ,
nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ.

15Ezi nghọta na-eweta ihuọma,
ma ụzọ nke ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi na-eduba ha na mbibi.

16Onye nwere uche na-eji ọmụma ihe nʼarụ ọrụ,
ma ndị nzuzu na-egosipụta enweghị uche ya.

17Onyeozi ajọ omume na-adaba na nsogbu,
ma onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ọgwụgwọ.

18Onye na-ajụ ịdọ aka na ntị ga-anwụ nʼụkpa na nʼihere;
ma onye na-anabata ịdọ aka na ntị ka a ga-asọpụrụ.

19Mgbe ihe a na-ele anya mezuru ọ na-atọ mkpụrụobi ụtọ,
ma ndị nzuzu kpọrọ isite nʼajọ ihe wezuga onwe ha asị.

20Na-eso ndị maara ihe ka ị ghọọ onye mara ihe,
nʼihi na onye na-eso ndị nzuzu na-aba na nsogbu.

21Nsogbu bụ ihe na-esogharị ndị mmehie,
ma ngọzị na-esogharị ndị ezi omume.

22Mgbe ezi mmadụ nwụrụ, ọ na-ahapụrụ ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya akụ,
ma mgbe onye mmehie nwụrụ, akụ ya na-abụ nke ndị ezi omume.

23Ubi onye ogbenye pụrụ inwe ọtụtụ ihe oriri,
ma ikpe na-ezighị ezi na-azachapụ ya.

24Onye ọbụla na-adọghị ụmụ ya aka na ntị, na-egosi na ọ hụghị ha nʼanya;
ma onye hụrụ ha nʼanya, ga-adọsi ha aka na ntị ike.

25Onye ezi omume na-eri nri ruo na nriju afọ onwe ya,
ma nri na-akọ nʼafọ onye ajọ omume.
Copyright information for IboBIU